Native Bible

Deuteronomy 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.

Deuteronomy 11:19 in English

Deuteronomy 11:19 · Berean Standard Bible

Teach them to your children, speaking about them when you sit at home and when you walk along the road, when you lie down and when you get up.

Context

17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu. 18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 19Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 20Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị. 21Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.