Diuteronomi 11:15
Deuteronomy 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
Deuteronomy 11:15 in English
Deuteronomy 11:15 · Berean Standard Bible
And I will provide grass in the fields for your livestock, and you will eat and be satisfied.
Context
13Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe, 14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv. 15Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere. 16Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha. 17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.