Diuteronomi 11:16
Deuteronomy 11:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
Deuteronomy 11:16 in English
Deuteronomy 11:16 · Berean Standard Bible
But be careful that you are not enticed to turn aside to worship and bow down to other gods,
Context
14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv. 15Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere. 16Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha. 17Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu. 18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.