Diuteronomi 11:13
Deuteronomy 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe,
Deuteronomy 11:13 in English
Deuteronomy 11:13 · Berean Standard Bible
So if you carefully obey the commandments I am giving you today, to love the LORD your God and to serve Him with all your heart and with all your soul,
Context
11Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe. 12Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya. 13Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe, 14ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv. 15Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.