Native Bible

Deuteronomy 1:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,

Deuteronomy 1:32 in English

Deuteronomy 1:32 · Berean Standard Bible

But in spite of all this, you did not trust the LORD your God,

Context

30Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ,* dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, 31nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.” 32Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu, 33bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso. 34Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.