Diuteronomi 1:31
Deuteronomy 1:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
Deuteronomy 1:31 in English
Deuteronomy 1:31 · Berean Standard Bible
and in the wilderness, where the LORD your God carried you, as a man carries his son, all the way by which you traveled until you reached this place.”
Context
29Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu. 30Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ,* dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, 31nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.” 32Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu, 33bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.