Native Bible

Deuteronomy 1:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ,* dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt,

Deuteronomy 1:30 in English

Deuteronomy 1:30 · Berean Standard Bible

The LORD your God, who goes before you, will fight for you, just as you saw Him do for you in Egypt

Context

28Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak* nʼebe ahụ.’ ” 29Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu. 30Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ,* dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, 31nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.” 32Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.