Daniel 7:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu* mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya.* Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.
Daniel 7:8 in English
Daniel 7:8 · Berean Standard Bible
While I was contemplating the horns, suddenly another horn, a little one, came up among them, and three of the first horns were uprooted before it. This horn had eyes like those of a man and a mouth that spoke words of arrogance.
Context
6“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. 7“Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri. 8“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu* mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya.* Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi. 9“Anọkwa m na-ele anya
“hụ ka e doziri ocheeze,
ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.
Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,
agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.
Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,
ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10Iyi na-asọ ka ọkụ
si nʼihu ya na-asọpụta.
Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi.
Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya.
Ndị ikpe nọdụrụ ala,
asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.