Daniel 6:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ.
Daniel 6:26 in English
Daniel 6:26 · Berean Standard Bible
I hereby decree that in every part of my kingdom, men are to tremble in fear before the God of Daniel: For He is the living God, and He endures forever; His kingdom will never be destroyed, and His dominion will never end.
Context
24Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala. 25Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa.
“Ka ọ dịrị unu na mma. 26“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.
“Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ,
nke na-adịgide ebighị ebi.
E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi,
ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ. 27Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.
Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube
nʼeluigwe na nʼụwa.
Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel
site nʼike ọdụm.” 28Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.