Daniel 6:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa. Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube nʼeluigwe na nʼụwa. Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel site nʼike ọdụm.”
Daniel 6:27 in English
Daniel 6:27 · Berean Standard Bible
He delivers and rescues; He performs signs and wonders in the heavens and on the earth, for He has rescued Daniel from the power of the lions.”
Context
25Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa.
“Ka ọ dịrị unu na mma. 26“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.
“Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ,
nke na-adịgide ebighị ebi.
E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi,
ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ. 27Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.
Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube
nʼeluigwe na nʼụwa.
Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel
site nʼike ọdụm.” 28Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.