Emọs 8:3
Amos 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”*
Amos 8:3 in English
Amos 8:3 · Berean Standard Bible
“In that day,” declares the Lord GOD, “the songs * of the temple * will turn to wailing. Many will be the corpses, strewn in silence everywhere!”
Context
1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara. 2Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”
A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.” 3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”* 4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,
na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa, 5na-asị,
“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe
ka anyị ree mkpụrụ ubi,
na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ
ka anyị ree ọka wiiti?”
Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,
na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,
na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.