Emọs 8:2
Amos 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”
Amos 8:2 in English
Amos 8:2 · Berean Standard Bible
“Amos, what do you see?” He asked. “A basket of summer fruit,” I replied. So the LORD said to me, “The end has come for My people Israel; I will no longer spare them.”
Context
1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara. 2Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”
A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.” 3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”* 4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,
na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.