Emọs 7:15
Amos 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
Amos 7:15 in English
Amos 7:15 · Berean Standard Bible
But the LORD took me from following the flock and said to me, ‘Go, prophesy to My people Israel.’
Context
13Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.” 14Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ. 15Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’ 16Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị,
“ ‘Ebula amụma megide Izrel,
ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’ 17“Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo.
Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo.
A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ,
ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ.
A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha
mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.