Emọs 6:8
Amos 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị, “Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m; ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị. Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”
Amos 6:8 in English
Amos 6:8 · Berean Standard Bible
The Lord GOD has sworn by Himself—the LORD, the God of Hosts, has declared: “I abhor Jacob’s pride and detest his citadels, so I will deliver up the city and everything in it.”
Context
6Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;
na-ete mmanụ makarịsịrị mma,
ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha. 7Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.
Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị. 8Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị,
“Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m;
ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị.
Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a
na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.” 9Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ. 10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.