Emọs 6:10
Amos 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
Amos 6:10 in English
Amos 6:10 · Berean Standard Bible
And when the relative who is to burn the bodies * picks them up to remove them from the house, he will call to one inside, “Is anyone else with you?” “None,” that person will answer. “Silence,” the relative will retort, “for the name of the LORD must not be invoked.”
Context
8Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị,
“Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m;
ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị.
Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a
na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.” 9Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ. 10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.” 11Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.
Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ,
tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile. 12Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?
Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri?
Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi,
mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.