Emọs 6:11
Amos 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
Amos 6:11 in English
Amos 6:11 · Berean Standard Bible
For the LORD gives a command: “The great house will be smashed to pieces, and the small house to rubble.”
Context
9Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ. 10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.” 11Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.
Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ,
tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile. 12Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?
Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri?
Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi,
mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu. 13Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba,*
ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.