Emọs 5:6
Amos 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ, ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ, ọ ga-erepịa ha. Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.
Amos 5:6 in English
Amos 5:6 · Berean Standard Bible
Seek the LORD and live, or He will sweep like fire through the house of Joseph; it will devour everything, with no one at Bethel to extinguish it.
Context
4Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,
“Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ. 5Unu achọla Betel,
unu abanyekwala na Gilgal,
maọbụ ga ije ruo Bịasheba.
Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ,
ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”* 6Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ,
ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ,
ọ ga-erepịa ha.
Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ. 7Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu,
na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala. 8Onye mere kpakpando pleiades na orion,
onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ,
na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị,
onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
wụsa ha nʼelu ala akọrọ,
Onyenwe anyị bụ aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.