Emọs 5:4
Amos 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel, “Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.
Amos 5:4 in English
Amos 5:4 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says to the house of Israel: “Seek Me and live!
Context
2“Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala,
ọ gaghị ebilite ọzọ,
onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya,
ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.” 3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel,
“Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike,
ka naanị narị ga-afọdụ,
obodo unu na-ezipụ narị ndị ike
ka naanị iri ga-afọdụrụ.” 4Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,
“Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ. 5Unu achọla Betel,
unu abanyekwala na Gilgal,
maọbụ ga ije ruo Bịasheba.
Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ,
ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”* 6Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ,
ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ,
ọ ga-erepịa ha.
Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.