Emọs 4:7
Amos 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara* mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
Amos 4:7 in English
Amos 4:7 · Berean Standard Bible
“I also withheld the rain from you when the harvest was three months away. I sent rain on one city but withheld it from another. One field received rain; another without rain withered.
Context
5Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko;
kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye,
nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel,
nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha* nʼobodo unu niile,
mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile
ma unu alọghachikwuteghị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 7“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara* mmiri izoro unu,
mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido.
Enyere m otu obodo mmiri ozuzo,
ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ.
Mmiri zoro nʼotu ubi,
ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ. 8Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ,
ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ,
ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge,
werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha,
zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile,
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.