Emọs 4:5
Amos 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Amos 4:5 in English
Amos 4:5 · Berean Standard Bible
Offer leavened bread as a thank offering, and loudly proclaim your freewill offerings. For that is what you children of Israel love to do,” declares the Lord GOD.
Context
3Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo,
ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ,
a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4“Gaanụ na Betel, ma jehie.
Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba.
Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile.
Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ* ọbụla. 5Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko;
kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye,
nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel,
nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 6“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha* nʼobodo unu niile,
mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile
ma unu alọghachikwuteghị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 7“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara* mmiri izoro unu,
mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido.
Enyere m otu obodo mmiri ozuzo,
ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ.
Mmiri zoro nʼotu ubi,
ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.