Emọs 4:12
Amos 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
Amos 4:12 in English
Amos 4:12 · Berean Standard Bible
“Therefore, that is what I will do to you, O Israel, and since I will do this to you, prepare to meet your God, O Israel!
Context
10“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe
dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt.
Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,
mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha.
Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu* unu jupụta imi unu,
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 11“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu
dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.
Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ,
ma unu alọghachikwuteghị m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 12“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel.
Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a,
jikere, O Izrel, izute Chineke gị.” 13Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile,
onye na-ekekwa ifufe,
nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ,
onye na-emekwa ka chi ọbụbọ* ghọọ ọchịchịrị,
na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
4:4 Maọbụ, nʼafọ atọ
4:6 Eze ha dị ọcha nʼihi erighị nri ọbụla
4:7 Maọbụ, kwụsịkwara
4:10 Maọbụ, ebe obibi
4:13 Ya bụ, ụtụtụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.