Emọs 4:13
Amos 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ* ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 4:4 Maọbụ, nʼafọ atọ 4:6 Eze ha dị ọcha nʼihi erighị nri ọbụla 4:7 Maọbụ, kwụsịkwara 4:10 Maọbụ, ebe obibi 4:13 Ya bụ, ụtụtụ
Amos 4:13 in English
Amos 4:13 · Berean Standard Bible
For behold, He who forms the mountains, who creates the wind and reveals His thoughts to man, who turns the dawn to darkness and strides on the heights of the earth— the LORD, the God of Hosts, is His name.”
Context
11“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu
dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.
Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ,
ma unu alọghachikwuteghị m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 12“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel.
Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a,
jikere, O Izrel, izute Chineke gị.” 13Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile,
onye na-ekekwa ifufe,
nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ,
onye na-emekwa ka chi ọbụbọ* ghọọ ọchịchịrị,
na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
4:4 Maọbụ, nʼafọ atọ
4:6 Eze ha dị ọcha nʼihi erighị nri ọbụla
4:7 Maọbụ, kwụsịkwara
4:10 Maọbụ, ebe obibi
4:13 Ya bụ, ụtụtụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.