Native Bible

Acts 7:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.

Acts 7:30 in English

Acts 7:30 · Berean Standard Bible

After forty years had passed, an angel appeared to Moses in the flames of a burning bush in the desert near Mount Sinai.

Context

28Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’* 29Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ. 30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị. 31Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị, 32‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’* Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.