Ọrụ Ndị Ozi 7:28
Acts 7:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’*
Acts 7:28 in English
Acts 7:28 · Berean Standard Bible
Do you want to kill me as you killed the Egyptian yesterday?’*
Context
26Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’ 27“Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? 28Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’* 29Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ. 30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.