Ọrụ Ndị Ozi 7:32
Acts 7:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’* Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
Acts 7:32 in English
Acts 7:32 · Berean Standard Bible
‘I am the God of your fathers, the God of Abraham, Isaac, and Jacob.’* Moses trembled with fear and did not dare to look.
Context
30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị. 31Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị, 32‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’* Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya. 33“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ. 34Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.