Ọrụ Ndị Ozi 22:9
Acts 22:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
Acts 22:9 in English
Acts 22:9 · Berean Standard Bible
My companions saw the light, but they could not understand the voice of the One speaking to me.
Context
7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ.
“Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ 9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu. 10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’
“Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’ 11Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.