Ọrụ Ndị Ozi 22:7
Acts 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
Acts 22:7 in English
Acts 22:7 · Berean Standard Bible
I fell to the ground and heard a voice say to me, ‘Saul, Saul, why do you persecute Me?’
Context
5Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ. 6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m. 7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ.
“Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ 9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.