Ọrụ Ndị Ozi 22:10
Acts 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’
Acts 22:10 in English
Acts 22:10 · Berean Standard Bible
Then I asked, ‘What should I do, Lord?’ ‘Get up and go into Damascus,’ He told me. ‘There you will be told all that you have been appointed to do.’
Context
8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ.
“Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’ 9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu. 10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’
“Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’ 11Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs. 12“Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.