Ọrụ Ndị Ozi 2:46
Acts 2:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
Acts 2:46 in English
Acts 2:46 · Berean Standard Bible
With one accord they continued to meet daily in the temple courts * and to break bread from house to house, sharing their meals with gladness and sincerity of heart,
Context
44Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ. 45Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị. 46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. 47Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.
2:21 Jul 2:28-32
2:28 Abụ 16:8-11
2:35 Abụ 110:1
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.