Native Bible

Acts 2:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.

Acts 2:45 in English

Acts 2:45 · Berean Standard Bible

Selling their possessions and goods, they shared with anyone who was in need.

Context

43Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche. 44Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ. 45Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị. 46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. 47Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị. 2:21 Jul 2:28-32 2:28 Abụ 16:8-11 2:35 Abụ 110:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.