Native Bible

Acts 2:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m,

Acts 2:34 in English

Acts 2:34 · Berean Standard Bible

For David did not ascend into heaven, but he himself says: ‘The Lord said to my Lord, “Sit at My right hand

Context

32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya. 33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị. 34Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m, 35ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’* 36“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.