Ọrụ Ndị Ozi 2:35
Acts 2:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’*
Acts 2:35 in English
Acts 2:35 · Berean Standard Bible
until I make Your enemies a footstool for Your feet.”’*
Context
33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị. 34Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị,
“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị,
“Nọdụ ala nʼaka nri m, 35ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’* 36“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.” 37Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.