Ọrụ Ndị Ozi 2:26
Acts 2:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,
Acts 2:26 in English
Acts 2:26 · Berean Standard Bible
Therefore my heart is glad and my tongue rejoices; my body also will dwell in hope,
Context
24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya. 25Devid kwuru banyere ya,
“ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile.
Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m.
Agaghị m ama jijiji. 26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ;
anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya, 27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ,
ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. 28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ;
ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.