Ọrụ Ndị Ozi 2:25
Acts 2:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.
Acts 2:25 in English
Acts 2:25 · Berean Standard Bible
David says about Him: ‘I saw * the Lord always before me; because He is at my right hand, I will not be shaken.
Context
23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu. 24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya. 25Devid kwuru banyere ya,
“ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile.
Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m.
Agaghị m ama jijiji. 26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ;
anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya, 27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ,
ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.