Ọrụ Ndị Ozi 2:21
Acts 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’*
Acts 2:21 in English
Acts 2:21 · Berean Standard Bible
And everyone who calls on the name of the Lord will be saved.’*
Context
19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe,
gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa,
ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ. 20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube. 21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku
aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’* 22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ. 23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.