Ọrụ Ndị Ozi 2:20
Acts 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
Acts 2:20 in English
Acts 2:20 · Berean Standard Bible
The sun will be turned to darkness, and the moon to blood, before the coming of the great and glorious Day of the Lord.
Context
18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha,
ka m ga-awụkwasị Mmụọ m.
Ha ga-ebukwa amụma. 19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe,
gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa,
ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ. 20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube. 21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku
aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’* 22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.