Ọrụ Ndị Ozi 15:37
Acts 15:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.
Acts 15:37 in English
Acts 15:37 · Berean Standard Bible
Barnabas wanted to take John, also called Mark.
Context
35Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị. 36Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.” 37Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa. 38Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha. 39Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.