Native Bible

Acts 15:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.

Acts 15:38 in English

Acts 15:38 · Berean Standard Bible

But Paul thought it best not to take him, because he had deserted them in Pamphylia and had not accompanied them in the work.

Context

36Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.” 37Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa. 38Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha. 39Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs. 40Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.