Ọrụ Ndị Ozi 15:20
Acts 15:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
Acts 15:20 in English
Acts 15:20 · Berean Standard Bible
Instead, we should write and tell them to abstain from food polluted by idols, from sexual immorality, from the meat of strangled animals, and from blood.
Context
18Nke a amaara site na mgbe ochie. 19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, 20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. 21Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.” 22Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.