Ọrụ Ndị Ozi 13:32
Acts 13:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
Acts 13:32 in English
Acts 13:32 · Berean Standard Bible
And now we proclaim to you the good news: What God promised our fathers
Context
30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. 33O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma,
“ ‘Ị bụ ọkpara m,
taa abụrụla m nna gị.’* 34Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru,
“ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.