Ọrụ Ndị Ozi 13:31
Acts 13:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.
Acts 13:31 in English
Acts 13:31 · Berean Standard Bible
and for many days He was seen by those who had accompanied Him from Galilee to Jerusalem. They are now His witnesses to our people.
Context
29Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. 30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. 33O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma,
“ ‘Ị bụ ọkpara m,
taa abụrụla m nna gị.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.