Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.

2 Samuel 6:4 in English

2 Samuel 6:4 · Berean Standard Bible

bringing with it the ark of God.* And Ahio was walking in front of the ark.

Context

2Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime* Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. 3Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ, 4nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ. 5Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu. 6Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.