Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime* Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.

2 Samuel 6:2 in English

2 Samuel 6:2 · Berean Standard Bible

And he and all his troops set out for Baale of Judah * to bring up from there the ark of God, which is called by the Name—* the name of the LORD of Hosts, who is enthroned between the cherubim that are on it.

Context

1Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi, 2Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime* Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. 3Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ, 4nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.