Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,

2 Samuel 6:1 in English

2 Samuel 6:1 · Berean Standard Bible

David again assembled the chosen men of Israel, thirty thousand in all.

Context

1Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi, 2Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime* Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. 3Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.