2 Samuel 6:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
2 Samuel 6:12 in English
2 Samuel 6:12 · Berean Standard Bible
Now it was reported to King David, “The LORD has blessed the house of Obed-edom and all that belongs to him, because of the ark of God.” So David went and had the ark of God brought up from the house of Obed-edom into the City of David with rejoicing.
Context
10O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. 11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile. 12Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. 14Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.