Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,

2 Samuel 6:14 in English

2 Samuel 6:14 · Berean Standard Bible

And David, wearing a linen ephod, danced with all his might before the LORD,

Context

12Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. 14Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, 15mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 16Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.