2 Samuel 6:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
2 Samuel 6:11 in English
2 Samuel 6:11 · Berean Standard Bible
Thus the ark of the LORD remained in the house of Obed-edom the Gittite for three months, and the LORD blessed him and all his household.
Context
9Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?” 10O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. 11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile. 12Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.