2 Samuel 24:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala.
2 Samuel 24:20 in English
2 Samuel 24:20 · Berean Standard Bible
When Araunah looked out and saw the king and his servants coming toward him, he went out and bowed facedown before the king.
Context
18Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.” 19Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad. 20Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala. 21Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?”
Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.” 22Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu,* ka ha bụrụ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.