Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu,* ka ha bụrụ nkụ.

2 Samuel 24:22 in English

2 Samuel 24:22 · Berean Standard Bible

Araunah said to David, “My lord the king may take whatever seems good and offer it up. Here are the oxen for a burnt offering and the threshing sledges and ox yokes for the wood.

Context

20Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala. 21Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.” 22Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu,* ka ha bụrụ nkụ. 23Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka Onyenwe anyị Chineke gị nabatakwa gị.” 24Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ Onyenwe anyị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.