Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.

2 Samuel 24:19 in English

2 Samuel 24:19 · Berean Standard Bible

So David went up at the word of Gad, just as the LORD had commanded.

Context

17Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” 18Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.” 19Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad. 20Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala. 21Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.